top of page

The Way We Were

Chapter Sixteen: OFO NA EKPERE NDI BENDE N'EKPE.

1 Chineke, Obasi bi n'elu na ala, bia maa nzu ma taakwa oji

2 Ala ama anyi, ala bende, ndi ichie bianu maa nzu ma taa oji

3 Mmuo ukwu na nke nta bianu maa nzu ma taakwa oji

4 Nna nna anyi ha, unu biko bianu maa nzu, were oji ma nuokwa mmanya

5 Ihe anyi n'ekwu bu egbe bere ugo bere nke si ibeya ebela, ka nku kwaa ya

6 Ekpere anyi n'nzukoa bu ka ji ghee vuruvuru zuo ndanda

7 Nihi onabu ngwo gbajuo n'elu ya ezuo onye no n'ala

8 Biko unu gbachiere anyi n'azu

9 Nye anyi ogologo ndu na ahu isike

10 Obu ya ka anyi jiri ekpere unu

11 Lekwanu nzu unu maa, oji unu taa na mmanya unu nuo

12 Gozie anyi.

[Central Igbo].

  • Facebook B&W
  • Twitter B&W
  • Google+ B&W

©2014

bottom of page